Strictly for the Igbos...

Dear reader, I am sorry for this type of message, it is strictly for a particular tribe in Nigeria, "Igbos."
The language below is theirs. Thanks for your understanding.

Ụmụ Igbo, mmamma nụ. Ka m jiri oghere a na nwa mgbe a were kwuwaa okwu banyere nhọpụta a ga eme gbasara onye isi n'ala anyị bụ Naijiria; nke ga adi mee ma afọ na abia dị n'ọnwa nke abuọ.

Ọdị ọtụtụ n'ime Ụmụ afọ Igbo bi na ala ndi ugwu (ndi n'akpọ isi na ala).
Nkọwa m were bụrụ: Ọbụrụ na GEJ merie ndị ebighi ugwu, ọgbaaghara kachasị ọgbaaghara gaje ịdapụta nke ga ata isi onye ajọ chi ọbụla kachiri ntị nọrọ n'ugwu awụsa.

N'agbanyeghị na mmeri GEJ ga ebute ọgbaaghara, anyi enweghi nhọrọ ọzọ ma ọbụghị ịtụnyere ya na nhọpụta ahụ.
Ọkaara anyi mma karia ndi ebighi ugwu mana ọga aka mma, a lụwa ọgụ, ka anọrọ nso n'ụlọ.

Mana ọ na agba mụ gharịị Ka ụfọdụ ji ghara ọgụ n'ihi mgbagbu. Ndi awụsa chọọ, ha kewara chịriwe onwe ha. Ihe ka mkpa bụ na n'ime ekensu na mmiri miri emi, ọka mma idanye na mmiri, eleghi anya, ị zọta ndụ.

Inwere onwe anyi ka nso n'ime ọchịchị GEJ karia onye ọkpọ isi ala ichiwa anyi.
Isi okwu m were bụrụ na ụnụ ga eziwe ozi. Zienụ ozia ka orue ndi ụmụ nne anyi ndi nọ n'ugwu awụsa azụ ahia ma ọbụ arụ ọrụ.
Kama emesia, udo dị, ha alachighaa.

Ọgwụ ka ọha m n'ọnụ. Birikwanụ!

Comments

Post a Comment

Thank you.

Popular posts from this blog

An Ozubulu Drug baron has been nabbed.

The real meaning of "X" in Xmas